Psalms 58

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam.

Ahụhụ nke ndị na-emebi iwu

1Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi?
O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?
2Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu,
aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.

3Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu;
site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
4Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ,
na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,
5nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya,
nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.

6O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ;
o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!
7Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ;
mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.
8Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya;
dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

9Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu,
ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
10Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ,
mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.
11Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị,
“Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ;
nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”
Copyright information for IboBIU